Job 38

Onyenwe anyị ekwuo okwu

1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:

2“Onye bụ onye a nke ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya
na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ìhè?
3Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa
nʼihi na enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị
nke m chọrọ ka i nye m ọsịsa ha.

4“Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa?
Gwa m ma ọ bụrụ na ị ghọtara.
5Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara,
onye setịrị ihe ọtụtụ e ji tụọ ya nʼelu ya?
6Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya,
onye doro nkume mbụ e ji tọọ ntọala ya?
7Mgbe kpakpando nke isi ụtụtụ zukọrọ bụọ abụ,
ụmụ Chineke niile tisikwara mkpu ọṅụ ike?

8“Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe
mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta,
9mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe,
werekwa ọchịchịrị meere ya akwa okike,
10mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị,
tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya,
11mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya,
nʼebe a ka a ga-akwụsị ebili mmiri mpako gị’?

12“O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu,
maọbụ mee ka chi ọbụbọ maara ọnọdụ ya,
13ka o jide akụkụ niile nke ụwa aka
ma site nʼụwa yọpụ ndị mmebi iwu?
14Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara;
ụdịdị ya na-egosipụta dịka uwe.
15A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè,
meekwa ka aka e weliri elu bụrụ nke a nyajiri.

16“I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri,
ka i jegharịala nʼebe miri emi nke ogbu mmiri?
17O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ?
Ka i jirila anya gị hụ ọnụ ụzọ nke onyinyo ọnwụ?
18Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ?
Gwa m, ma ọ bụrụ na ị maara ihe ndị a niile.

19“Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi?
Olee ebe ọchịchịrị bi?
20Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi?
Ị maara ụzọ e si eje ebe obibi ha?
21Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a!
Ị bikwaala ọtụtụ afọ.

22“Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo,
ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe,
23nke m chekwara nye oge nsogbu,
nʼoge ọgụ na nʼoge agha?
24Kedụ ụzọ e si ejeru ebe a na-anọ ekesasị amụma egbe eluigwe,
ebee ka e si ekesasị ifufe ọwụwa anyanwụ nʼelu ụwa?
25Onye wara ụzọ maka oke mmiri ozuzo,
onye kwa waara amụma na egbe eluigwe ụzọ?
26Si otu a mee ka mmiri zokwasị ebe mmadụ na-ebighị,
ala ọzara ebe ọ dịghị onye nọ nʼime ya,
27ka mmiri ozuzo mee ka ala kpọrọ nkụ nweta mmiri
iji mee ka ahịhịa pupụta nʼime ya.
28Mmiri ozuzo o nwere nna?
Onye mụrụ igirigi?
29Site nʼakpanwa onye ka mkpụrụ mmiri si apụta?
Onye kwa bụ nne oke oyi nke eluigwe,
30nke na-eme ka mmiri kpụkọtaa dịrị ike dịka nkume,
meekwa ka ihu ogbu mmiri kpụkọta?

31“Ị pụrụ ikechi agbụ niile nke Pleiades?
Ị pụrụ ịtọpụ ihe nkechikọta Orion?
32Ị pụrụ ime ka igwe kpakpando pụta nʼoge ha
maọbụ dupụta anụ ndọgbu Bịa na ụmụ ya ndị ọzọ?
33Ị maara iwu na-achị ihe niile dị na mbara eluigwe?
Ị pụrụ inye ha ike ịchị ụwa?

34“Ị pụrụ iti mkpu ruo igwe ojii
si otu a mee ka idee mmiri kpuchie gị?
35Ị pụrụ izipụ amụma egbe eluigwe nʼụzọ ha?
Ha na-asị gị, ‘Ebe a ka anyị nọ’?
36Onye na-etinye amamihe nʼobi mmadụ,
maọbụ na-enye oke ọkpa nghọta?
37Onye nwere amamihe ịgụ igwe ojii niile dị na mbara eluigwe ọnụ?
Onye kwa pụrụ ịhulata karama mmiri niile nke eluigwe niile,
38mgbe aja dị nʼala siri ike,
mgbe ọkpụrụkpụ aja dị nʼala na-akpụkọta nʼahụ ibe ha?

39“Ọ bụ gị na-achụtara nne ọdụm ihe oriri,
mee ka afọ ju ụmụ ọdụm
40mgbe ha makpuuru nʼime ọgba ha,
maọbụ mgbe ha zoro onwe ha na-eche anụ nʼọhịa?
41Onye na-edoziri ugolọma ihe oriri ya,
mgbe ụmụ ya na-etiku Chineke mkpu agụ,
mgbe ha na-akpagharị na-achọ ihe oriri?
Copyright information for IboBIU